Akụkọ kachasị n’abalị a: Ipob sị onye apụla na 30 Mee

By | May 26, 2018

51 total views, 3 views today

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa:

Ipob amalitela izisa ozi maka Mee 30

Image copyright Ebere Ekeopara
Nkenke aha onyonyo 30 Mee 1967 bụ ụbọchị agha Biafra na Naịjirịa bidoro

Ndị IPOB amachiela ọrụ ma ọbụ ahịa ubọchị 30 Mee afọ a.

Otu ahụ na-akpọkụ oru na Igbo ka ha tukwuru n’ụlọ maka ncheta ndị egburu na agha nakwa ndị egburu kemegbe gbanụgbanụ mnwere onwe Biafra bidoro.

Ọkụ na-agba ebe ana-amịpụta mmanụ agbidi na Yenegua

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Depthwize bụ ụlọọrụ n’egwuputa mmanụ agbidi nke ọtụtụ ndị nwe ya bụ Naịjirịa na ndị mba ọzọ

Oke ọkụ na agba n’ebe ana-egwuputa mmanu agbidi n’ime oshimiri dị na Yenegua taa, dịka ụlọọrụ Reuters kwuru.

Ndị akaebe hụrụ ya bụ ọkụ sị na ya bụ ọdọmmanụ nke ndị Depthwize nwe ka na-agba ọkụ ruo n’ehihihi a.

Ka ọdị ụgbụa, ndị ụlọọrụ ahụ ekwubeghị ihe kpatara ya bụ ọkụ.

Akụkọ mba ofesi

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Iwu a ga-eme ka nwaanyị nwee ike ịnata ikike maka iwepu afọime rugoro izuuka iri na abou (12).

Na mba ofesi, mba Ireland ekwekọrịtala na nwaanyị nwere ikike itepu afọime ọchọghị.

Mba ahụ mere ntuliaka ebe mmadụ persenti iri isii na asatọ (68%) nọ kpebie na ha achọghịzị ya bụ iwu nke megidere nwaanyị itepu afọime.

Ana atụ anya n’iwu a ga-amalite ịdị ire na ngwucha afọ a.

N’egwuregwu;

Real Madrid na Liverpool ga-akwata n’abalị a

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Asọmmpị a ga-abụ na ọgbọegwu bọlụ Kiev Olympic na Ukraine

, Real Madrid na Liverpool ga akwarịta mpị na ekwucha ọgwụ nke Champion league taa.

Loading...

Ya bụ asọmpi ga-amalite na mgbede a ma ọfọdụ nkejị iri na ise ka ọ kụọ elekere asatọ (7:15).

Gere akụkọ mere na mgbede a n’otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media caption‘Etu anyi siri nwuchie nwoke gburu nwunye ya maka ekworo’

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...