Akụkọ kachasị n’abali a: Shehu Sani chọrọ ka e nye ndị Ogoni 9 nturuugo

By | June 14, 2018

35 total views, 3 views today

Akụkọ kachasị mere taa;

Shehu Sani chọrọ ka ndị Ogoni 9 nweta nturuugo

Sinetọ Shehu Sani ekwuola sị na gọọmentị etiti kwesịrị ịrịọ ezinaụlọ Ken Saro Wiwa na ndị ogoni ndị ọzọ ahụ nwụrụ anwụ mgbaghara ma nyekwa ha nturuugo.

O kwuru sị ka e nyekwa Shehu Musa Yaradua, Beko Ransome-Kuti nakwa Chima Ubani nturugo.

Etigbuolanwoke gburu nwaanyị

E tigbuola otu nwoke n’obodo Kisumu dị na mba Kenya ka a hụrụ ozu nwaanyị ọ fọnyere n’ime akpati.

Kim Jong-Un a ga-aga Rọshịa?

Image copyright Getty Images

Vladimir Putin bụ onyeisi mba Rọshịa akpọọla Kim Jung-un nke Nọt Koria oku ka ọ bịa njem nleta na Rọshịa n’ọnwa nke asatọ nke afọ a.

Putin sị na ya nabatara ogbakọ Kim na Trump mere n’ime ụbọchị ole na ole gara aga.

N’egwuruegwu,

Image copyright Getty Images

Asọmpi Iko Mbaụwa nke 2018 ebirila ọkụ taa, dịka mba Rọshịa bu ụzọ nye goolu mbụ n’asọmpi ahụ.

Ọ bụ Yuri Gazinskiy nke Rọshịa ji isi buba boolu a na nkeji iri na otu ebidochara ya bụ egwuruegwu.

Loading...

Rọshịa mechara gwọọ Sawudi Arebia ka ji mmanụ. Ha gbatara Roshịa 5 – Sawudi 0.

Gere akụkọ mere na mgbede a n’otu nkeji:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionAkụkọ ga-amasị gị ikọ mgbe ọbụla

Lee ihe nkiri taa

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionRọshịa 2018: Super Eagles nọ n’otu kachasi ike

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...