Akụkọ kachasị n’ụtụtụ a: Palestine na-akwado ime ngagharị iwe

By | May 15, 2018

44 total views, 3 views today

Akụkọ ndị dị mkpa n’ụtụtụ a:

Na Naịjirịa

Image copyright Anglicancommunionawka.com
Nkenke aha onyonyo Bishop Alex Ibezim bụ Bishọp ndị Angịlịkan na Ọka Dayasis

Bishọp Alex Ibezim ụka Aglican nke Awka Diocese ekwuola na ike agwula ndị Naịjiria ị nara ozi ị ti aka n’obi.

Ọ gwara onyeisiala Buhari ka ọ ghara ị hụ ndị na-achị ehi na-egbu mmadụ dịka ndị ụmụnna ya.

N’okwu yiri ibe ya…

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Otu ọzọ na-achọ mwere onwe Biafra ekeela ụbọchị 30 May ụbọchị ncheta Biafra

Onye ndu otu Biafra Independence Movement bụ Ralph Uwazuruike ekwuola na ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa bụ nkata ọchịchị Buhari iji gbanwee Naịjiria ka ọ bụrụ mba ndị Alakoba.

O kwuru na otu ihe a mere na Kwara Steeti n’afọ 1811 mgbe egburu onye ndu ndị Yoruba ma were ọchịchị rue ugbu a.

Akụkọ ofesi

Image copyright AFP

Ndị mba Palestine na-akwado ime ngagharị iwe megide mba Isreal maka ogbubu ndị mmadụ dị iri ise na ise ndị agha mba Isreal gburu echi gara aga

Egwu ga-adị na Gaza bụ ebe agaelị ndị nwụrụ anwụ.

N’Egwuregwu,

Image copyright AFP

Mba Austrelia agwala ndị zoro n’obodo ha n’oge egwuregwu Commonwealth ka gosi onwe ha ugbua ma ọ bụ a nwụchie ma tụlata ha n’ike.

Ebe…

NFF bụ Amaju Pinnick ekwuola na otu Super Eagles na ndị DR Congo ga-aga n’ihu ezute n’asọmpi enyi na enyi agbanyeghi akụkọ ọrịa ebola.

Ịhe ọzọ ị kwesiri ị ma

Loading...

Awaala Melania Trump, nwunye onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ahụ maka akpụ dị n’akụrụ ya.

Image copyright AFP

Gee nkeji nke ụtụtụ a ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionIhe Uche Ogbuagu huru mgbe ọrụọrụ na gọọmenti Imo Steeti

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...