Akụkọ kachasị taa: Buhari na Ali-modu Sheriff zutere onwe ha taa

By | May 17, 2018

23 total views, 3 views today

Akụkọ ndị dị mkpa n‘abalị a:

Onyeisiala Buhari na Ali-modu Sheriff nwere mkparịta ụka

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Mohammdu Buhari na onyeisi ala Amerika Donald Trump enweela ọgbakọ

Onyeisiala Mohammadu Buhari na onye bụbụ onyeisi oche otu PDP bụ Ali-modu Sheriff nwere mkparịta ụka ime ụlọ n’ụlọọrụ onyeisiala na’Abuja taa.

Cheta na ụlọikpe chuturu Sheriff n’ọkwa onyeisis oche ndị PDP n’afọ gara aga, mana ọ laghachiela APC.

Otu Restoration ndị APC Imo Steeti akatọọla Rochas

Okwu ka na-arị ibe ya elu n’ime ntụliaka ndị otu APC Imo Steeti mere n’izuụka gara gaga.

Dịka otu kpọrọ onwe ha Restoration group nke onye ndụ ha bụ TOE Ekechi kwuru na ndị Imo Steeti niile ajụla Gọvanọ Okorocha.

Akụkọ ofesi

Image copyright Getty Images

Oke egwu ji ndị mba DR Congo ugbu a dịka ọrịa ebola nke dị n’otu ime obodo abatala n’otu obodo mepere emepe akpọrọ Mbandaka.

Mịnịsta na-ahụ maka ahụike na mba DR Congo bụ Oly Ilunga Kalenga kwupụtara nke a.

N’Egwuregwu

Image copyright Getty Images

Naịjirịa ka nọ n’ọkwa iri anọ na asaa na ndị kacha agba bọọlụ na mba ụwa nille nakwa ọkwa isii n’Afrịka.

Nke a dị n’ogogo otu egwuregwu bọọlụ ndị Coca Cola na FIFA wepụtara taa.

Loading...

Gee ya nkeji nke abalị a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionAkụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Ihe onyonyo nke taa:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionIhe ndị “Restoration Group” kwuru

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...