Akụkọ ndị dị mkpa n’ịchafụ: Okezie Ikpeazu ekeleela Amaju Pinnick

By | July 13, 2018

20 total views, 3 views today

Isiokwu ndị dị mkpa na mgbede a

Nkenke aha onyonyo SAN bụ ugwu kachasị ugwu a na-enye onye ọkaiwu pụrụ iche na Naijiria

Ụmụ afọ Igbo ruru asatọ so na ndị e bulitere n’ọkwa ọkaibe dịka ndị ọkaiwu nke a kpọrọ ‘Senior Advocates of Nigeria (SAN).’

Ha bụ George Igbokwe, Emmanuel Achukwu, Kenneth Ahia, Abuchi Madu,Louis Alozie, Sonny Wogu, ọkammụta Offorinze Amucheazi, Edmund Obiagwu nakwa Cosmas Enweluzo.

Ndị na-azụ ahịa enwela mmeri taa.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Steeti ndị ahụ kwuru na iwu na-ekewa ezinaụlọ megidere iwu ala ha bụ ‘Constitution’

Ụlọịkpe n’Abuja amanyela iwu ka-ewugharịa ọdọ ahịa ndị gọọmentị obodo ahụ kwaturu n’ụlọahịa Karmo n’Abuja.

Ndị ihe a metụtara kpụpụrụ ngalaba na-ahụ maka Abuja nakwa minista na-ahụ maka isi obodo Naịjirịa kemgbe 2011 maka nkwatu a mere n’afọ 2006.

#Ekitidecides

Image copyright BBC Yoruba

Dịka a na-akwado ntuliaka ọkwa Gọvanọ n’Ekiti steeti echi ụlọakụ, ụlọakwụkwọ na ụfọdụ ngalaba gọọmentị dị ịcheiche agbachiela n’oge.

Ọge ọchịchị aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Ayodele Fayose ga-ebi echi mgbe a họpụtara onye ga-anọchị anya ya.

N’akụkọ ofesi,

Image copyright BBC Tamil
Nkenke aha onyonyo N Logeswari bụ nwataakwụkwọ nwụrụ mgbe a kwara ya aka

Ndị uweojii na mba India anwụchiela otu onye nkuzi kwara nwataakwụkwọ ya aka o we siri n’elu ụlọ dapụ nwụọ.

N Longeshwari bụ aha nwata ahụ na-atụ egwu isi n’elu ụlọ ahụ wutuo mgbe ha na-eme ọzụzụ nchekwa tupu onye nkuzi ahụ kwaa ya aka.

N’egwuregwu,

Image copyright @okezieikpeazu
Nkenke aha onyonyo Okezie Ikpeazu were oche ọchịchị Abia Steeti n’afọ 2015

Gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu enyela Amaju Pinnick ekele pụrụịche maka ọkwa ọhụrụ enyere ya dịka osote onyeisi CAF

Cheta na achụrụ Amaju Pinnick n’ọrụ dịka onyeisi ngalaba egwuregwu bọọlụ nke Naịjirịa n’ụbọchị ole na ole gara aga.

Loading...

Ị ma chi ndị Igbo na-efe n’oge gboo?

Gụọ ya ebe a:

Nkenke aha onyonyo Dịka ala, agwọ eke bụ onyeozi ọtụtụ ofeke mmụọ

Ị ma chi ndị Igbo na-efe n’oge gboo?

Gee nkeji nke mgbede a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị kọ mgbe ọbụla

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...