Anyi anaghi atu egwu Okorocha – ndị nkewa APC Imo

By | May 17, 2018

20 total views, 3 views today

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi

Media captionIhe ndị “Restoration Group” kwuru

Esemokwu onye ga abụ onye ga-anọchịte anya ndị APC Imo dịka gọvanọ na ntụlịaka nke 2019 ka na-adakwa.

Loading...

Cheta na esemokwu a pụtara ihe n’ọnwa a, mgbe ha mere nhazi akpọrọ “Congress” a ga-eji họpụta onye ga-eji aha pati ahụ zọọ ọkwa gọvanọ.

Taa, otu n’ime ndị kewapụtara n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị APC kpọrọ ndị ntaakụkọ n’isi ụlọọrụ ha maka ị kọwa echiche ha n’esomokwu nke di n’etiti ndị APC nke Imo steeti.N’ọnụ okwu TOE Ekechi bụ onụ na-ekwuchitere otu a, ha na-ebo gọvanọ Okorocha ebubo na o nupuru iwu ji patu ha isi ọtụtụ oge.

A nwụchiela mmadụ anọ maka izu akwụkwọ ntuliaka APC Ekechi kwuru na “Okorocha eriela ego niile dị n’Imo steeti, ndị Igbo na APC ajụla Okorocha n’Imo”Ọ gakwara n’ihu na-ebo Okorocha ndị omeiwu nke Imo steeti ebubo na ha anaghị arụ ọrụ ọbụla n’Imo steeti. Ekechi kwuru na ha nwere ihe onyonyo ruru 40 ga-abụ ihe ga-akwụ dịka ihe akaebe ha na ntuliaka “Congress” mere n’Imo steeti.

Nkenke aha onyonyo Ndị “Restoration Group” si na ha ga alaghachị Imo maka ntụlịaka

Ha kwukwara na Okorocha a na-abataghị ntuliaka emere n’Imo steeti maka na ọ na-agba mbọ ihụ na ọgọ ya nwoke were ọchịchị gọvanọ n’afọ 2019. Otu a na-ekwu kwa na Okorocha ekwughi eziokwu mgbe ọkpọro ndị mmadụ aha na ha esoghi na pati. BBC Igbo jụrụ onye ode akwụkwọ Gọvanọ Okorocha bụ Sam Onwuemeodo ihe ochere banyere n’ihe niile ndị “Restoration Group” na-ekwu mana ọ gwara anyị na-onweghị ihe ọ ga-ekwu banyere ha maka n’uche ya, ha emechala ihe ha nwereike ime. “Ike agwụla ha,” Onwuemeodo gwara anyị.Ekechi na ndị otu ya kwuru na ha ga-abata Imo steeti maka ntụlịaka ga-eme echi bụ ụbọchi iri na asatọ nke ọnwa Mee.

Akụkọ ga-amasị gị:

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...