Ginị mere nwamba na-ebute egwu n’ime ọtụtụ mmadụ?

By | June 14, 2018

34 total views, 3 views today

NwambaImage copyright Adline Okere
Nkenke aha onyonyo N’ala Bekee nwamba bụ anụmanụ a na-ahụ n’anya ọfụma ọfụma

Nwamba maọbụ ‘buusu’ bụ anụmanụ na-ebute nnukwu egwu n’obi ọtụtụ mmadụ n’ala Naịjiria.

Ọ kachasị njọ n’ala Igbo, maka na ọ bụrụ na ị gbaa ọtụtụ ndị Igbo ajụjụ gbasara nwamba, ha ga-agwa gị na nwamba bụ ajọ anụmanụ.

Anyị jụrụ ndị mmadụ dị iche iche ihe mere ha ahụghị nwamba n’anya ncha ncha, aziza ọtụtụ ha tụrụ anyị n’anya.

N’echiche ọtụtụ ndị anyị gbara ajụjụ:

Nwamba bụ amusu!

Nnamdi Nwosu kwukwara na ọ bụ nwamba jiri ojii bụ nke bụ amusu.

N’ọnụ okwu ya ”Nwamba bụ anụmanụ na-eme juu, na kwa na-aga kwa nwanyọọ, ihe a bụ ihe na-ebute egwu n’obi’m”.

Image copyright Adline Okere
Nkenke aha onyonyo Egbuola ọtụtụ nwamba maka ebubo na a bụ amusu

Anya nwamba na-atụkwa ndị ọzọ egwu

Patrick Adigwe gwara anyị na mkpụrụanya nwamba bụ ihe na-atụ ya egwu.

“Anya a na-eke dịka ọkụ n’abalị, kedụ ụdị anụmanụ bụ nke ahụ?”

Image copyright Adline Okere
Nkenke aha onyonyo Nwamba na agwọ bụ anụmannụ abụọ na-ebute egwu

Nwamba nwere nsi

Otu nwoke aha ya bụ Peter Obiejesi kwuru na n’uche ya nwamba nwere nsi n’eze ya nakwa na mbọ ya, nke mere o ji atụ ya egwu.

Mana otu nwoke aha ya bụ Chika Jones bụ onye hụrụ nwamba n’anya kwuru na ihe a niile ndị mmadụ na-ekwu esighị n’aka nwamba.

Image copyright Chika Jones
Nkenke aha onyonyo Chika Jones na nwamba ya

Jones kwuru na “Nwamba bụ anụmanụ na-apụta n’abalị ịchọta ihe ọ ga-eri.

Ihe a mere ka ndị mmadụ kwubiri na ọ bụ amusu. N’echiche ha, ihe ọbụla na-aga n’abalị bụ amusu.”

Jones kwukwara na ihe a mere ka ndị mmadụ na-eji ụdị anya a nke a na-elekwa agwọ, maka na agwọ na-aga n’abalị.

Gịnị ka omenala Igbo kwuru maka nwamba?

Chigozie Nnabuihe bụ onye okammụta n’omenala Igbo kwuru na Igbo enweghi iwu ọbụla kpebiri na nwamba bụ anụmanụ ọjọọ maọbụ amusu.

Nnabuihe kwukwara na o nwere ndị na-eri nwamba n’ala Igbo.

Patrick Adigwe kwetara n’okwu a makana o kwuru na o nwere ndị obodo n’Ibusa n’ime Delta steeti na-eri nwamba.

Image copyright Adline Okere
Nkenke aha onyonyo Emume nwamba puruiche bu ihe na-ebute ụfọdụ egu

Ebee ka egwu nwamba sịrị ba?

Loading...

Ndị anyị gbara ajụjụ ọnụ n’akụkọ a kwuru na ọ dị ọrụ ikwu ebe egwu nwamba sịrị bịa.

Nnamdi Nwosu kwuru na ọ dị ka na ihe nkiri na-apụta na Nollywood tinyere aka n’ibute nnukwu egwu gbasara nwamba.

Peter Obiejesi kwekwara n’ihe Nwosu kwuru. O kwuru na “ọtụtụ ihe nkiri na Nollywood na-egosi ndị amusu na-aghọ nwamba. Ihe a sokwa na-ebute egwu”

Ebubo amusu

Chika Jones kwuru na o nweela ndị kpọrọ ya amusu maka na ya nwere nwamba n’ụlọ.

Jones kwuru na “Echiche m bụ na ndị a kwuru ihe a na-egwuso m egwu mana o nweela ọtutụ mmadụ kwuru na ha agaghị abịa be m maka na enwere m nwamba. Ọ bụghịkwa egwuregwu o.”

O kwuru na ya nwere olileanya na ndị mmadụ ga-akwụsị igbu nwamba n’ihi na ụwa na-asala anya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...