Nafdac laghachinụ n’ọdọ ụgbọ mmiri-Osinbajo

By | May 18, 2018

64 total views, 3 views today

Nwata nwoke na-aṅụ ọgwụ ụkwara,copdeine
Nkenke aha onyonyo Akụkọ na-ekwu na ụfọdụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-eke ndị ntorobịa ọgwụ dịka ihe onyinye

Ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara ọgwụ na nri akpọrọ Nafdac ekwuola na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo enyela iwu ka ha laghachi na ọdọ ụgbọmmiri ọzigbo.

Iwu a biara ka o tebeghi aka onyeisi Nafdac bụ Mojisola Adeyeye boro ọṅuṅu ọgwụ ike dị n’etiti ndị ntoroọbia na ntụbata ụfọdụ ihe ndị amachiri n’iwu.

Nafdac kwuru na mkpebi a ga-enyeaka ibelata ntụbata ogwuike na ihe ndị ọzọ na-adịghị ahụ mma na Naịjirịa.

N’ọnụ ha,”Nafdac natara akwụkwọ osote onyeisiala weputara na Mee 16.”

Adeyeye kwuru na n’oge adịghị anya ọtụtụ ndị Naịjirịa anwụọla maka ọgwụ ike na nri na adịghị ahụ mma.

Ọ kwuru na ọgwụike dịka Codeine,Tramadol, na pentazocine egbuola ọtụtụ ndị mmadụ.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọgwuike egbuola ọtụtụ ndi ntoroọbia na Naịjirịa n’oge na-adịghị anya
Loading...

N’ọnụ ya,ọnwụ ndị a mere maka e wepụrụ Nafdac na ọdọ ụgbọ mmiri kemgbe 2011.

Adeleke kwuru na ọ bụkwa maka ihe nyocha ndị BBC mere nke gosipụtara nnukwu ọhọm dị n’ọgwụ akpọrọ Codeine wetara uche Nafdac n’ịlaghachị n’ọdọ ụgbọ mmiri.

O kwuru na Nafdac ga-akwụsị mbụbata ọgwụike n’ọdọ ụgbọ mmiri.

Akụkọ ndị ga-amasi gị:

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...