World Cup 2018: Kroeshia agbapụla Ingland n’ụzọ njem ị bute ikombaụwa

By | July 11, 2018

40 total views, 3 views today

Ingland na Kroeshia

Oge ezuola! Kroeshia emeriela asọmpị ha na Ingland. Ha ga-agba Fransị n’ụbọchị n’abịa.

Ewepụrụ Mandzukic n’elekere 114 tinye Corluka nke mba Kroeshia. Ọ dịka Mandzukic emerụrụ ahụ.

N’elekere 109, Mandzukic enyela ọkpụ goolu ọzọ. Ọ dịka Ingland a ga-ebido ị kwara akpa ha maka ịna.

N’elekere 101, Kroeshia wepuru Rebic tinye Kramaric. Asọmpị nke a ebirila ọkụ di egwu.

N’elekere 96 ewepụrụ Henderson nke Ingland tinye Dier.

N’elekere 95 enyere Rebic akwụkwọ edo maka ị kwatu otu onye ọgba bọọlụ Ingland, nke a butere Ingland penariti.

N’elekere 74, ewepụrụ Raheem Sterling tinye Marcus Rashford.

N’elekere 67, o meeela! Perisic etinyela ya na neeti mba Ingland.

Image copyright Getty Images

N’elekere 64, Perisic bịara nso ị gbaka neeti ndị mba Ingland.

N’elekere 60, ewooo! Rakitic enyechala goolu ahụ. Ndị Kroeshia amalitela ị gbasi bọọlụ ike.

N’elekere 53 enyere Kyle Walker onye ọgba bọọlụ Ingland akwụkwọ edo iji dọ ya aka na ntị maka omume ya.

Alaghachitela ịgba aka nke abụọ n’asọmpị dị n’etiti Kroeshia na Ingland.

N’elekere 35, Sterling nwaa kwara ị gba Kroeshia ọkpụ goolu ọzọ mana o nweteghị ya. Ndị otu egwuregwu Ingland na-anwa ị gbanye goolu ọzọ.

Loading...

N’elekere 29, ọ fọrọ obere ihe ka Harry Kane nyere Ingland ọkpụ goolu ọzọ mana ọ baghị.

A kwaturu Raheem Sterling butere ogbu opi ịnyer Ingland ‘Offisde’.

Kieran Trippier nyere goolu mbụ nke mba Ingland n’elekere ise n’asọmpị a.

Ndị na-agbara Ingland bụ Jordan Pickford; Kyle Walker, John Stones, Harry Maguire; Jordan Henderson; Kieran Trippier, Jesse Lingard, Dele Alli, Ashley Young; Raheem Sterling, Harry Kane.

Ndị na-agbara Kroeshia bụ Danijel Subasic; Sime Vrsaljko, Dejan Lovren, Domagoj Vida, Ivan Strinic; Marcelo Brozovic; Ante Rebic, Luka Modric, Ivan Rakitic, Ivan Perisic; Mario Mandzukic.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

Loading...